By ADEDOKUN THEOPHILUS
Ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ na-alụ ọgụ megide ọghọm n’ala Nigeria, nke a anakpo Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), jiri ego ruru narị nde naịra ise na iri isii na atọ n’ịzụ kọmputa na igwe na-eme fotokopi n’ime afọ ise gara aga, ha ka na-etinye narị nde atọ ọzọ n’akwụkwọ ego afọ 2025 maka otu ihe ahụ.
Southern Herald chọpụtara na ewepụtara ego a buru ibu maka ịzụta ngwa ọrụ di iche iche site na 2020 ruo 2024.
Ndabere na ozi Southern Herald nwetare site na GovSpend, ebe ụmụ amaala nwere ike inwete ozi gbasara mmefu nzụta gọọmentị, a chọpụtara na EFCC natara ego ahụ site na 2020 ruo 2024. Enwetakwara na ụlọ ọrụ mmadụ asatọ (8) natara oke nime ego a na nkeji iri na atọ.
Ụlọ ọrụ ndị natara ego a kwesịrị ka ha mee mmezi ma ọ bụ zụta ngwa ọhụrụ maka EFCC. Ihe ndị a zụtara gụnyere igwe na-eme fotokopi na kọmputa. Ozi e kpọrọ pụta site n’ihe a chọpụtara gosiri na a kwụrụ ụlọ ọrụ ndị a ego n’etiti Wenezdee, Novemba 18, 2020, na Tuzdee, Epreel 2, 2024.
Otu o di, Southern Herald chọpụtara na ọtụtụ n’ime ụgwọ a kwụrụ ekwughi kpọmkwem igwe ole ma ọ bụ kọmputa ole azụtara. Nkọwa gbasara ịdị mma na ọnụ ọgụgụ akụrụngwa a zụtara nwere oghere, n’ihi na enweghị nkọwa zuru oke gbasara ihe azụtara. N’agbaghi nka, EFCC abịawo kwa ịrịọ ego ọzọ ruru narị nde atọ n’akwụkwọ ego ya maka afọ 2025 iji zụta ihe yiri nke ndi a gara aga. Mmefu emere maka ọrụ akpọghị aha hoo haa na mmefu ego na-emebi Nkebi 16, Ngalaba 6 nke Iwu Zụta Ngwa Gọọmenti (Procurement Act 2007). Iwu ahụ kwuru hoo haa na:
““n’ụzọ doro anya, n’oge kwesịrị ekwesị, n’ụzọ kwekọrọ n’ihe, iji hụ na e nwere ọrụ ziri ezi na nkwado na iwu a na iwu ndị sitere na ya; (e) iji nweta uru zuru oke site na ego e jiri ya mee ihe na iji rụọ ọrụ nke ọma; (f) n’ụzọ na-akwalite asọmpi, akụ na ụba na arụmọrụ; (g) nakwa n’ime usoro na oge e guzobere n’Iwu a na dịka Bureau nwere ike ịkọrọ oge n’oge.
N’ịgbaso nke a, Southern Herald chọpụtara na ụfọdụ n’ime ngwa ndị a zụtara n’oge a n’akụkọ a mebiri ihe iwu Public Procurement Act kwuru, nke kwuru hoo haa na e kwesịghị inye ụlọ ọrụ na-enweghị aha ọrụ ọ bụla. Anyị chọpụtara na ụlọ ọrụ abụọ n’ime ndị natara ụgwọ iji zụta ụfọdụ ngwa a edebanyeghị aha nke ọma n’oge enyere ha nkwekọrịta ahụ.
Southern Herald nyochara ndekọ Corporate Affairs Commission (CAC) wee chọpụta na Patriots Arsenal Limited, otu n’ime ụlọ ọrụ EFCC nyere nkwekọrịta, debara aha ya na Fraịdee, Mee 31, 2021. Mana EFCC nyere ụlọ ọrụ a ma kwụọ ha ụgwọ n’ime ọnwa atọ doro anya tupu ha ede aha ha n’usoro iwu.
Nchọpụta gosiri na ụlọ ọrụ Patriots Arsenal Limited natara ihe karịrị nde iri na anọ na Mọnde, Febụwarị 22, 2021, maka igote ngwa ulo oru dị iche iche e kwụghị kpọmkwem. A chọpụtara na ihe a bụ mmejọ megide iwu dị ugbu a, karịsịa Nkebi 16, Ngalaba 6 nke Iwu Zụta Ngwa Gọọmenti (2007).

Anyị chọpụtara na ụlọ ọrụ ọzọ, IT Touch Limited, nke debara aha ya na Fraịdee, Febụwarị 24, 2021, natara ụgwọ maka nkwekọrịta na Machị 19, 2021. Nke a bụ naanị otu ọnwa mgbe ha debanyere aha ya. Nọmba ndebanye aha ya bụ RC-1762804. Ọ bụ ezie na enweghị iwu doro anya machibidoro inye nkwekọrịta n’aka ụlọ ọrụ ọhụrụ, mana odizika amuuma nefere anya ufodu ihe ndị di mkpa dịka akwụkwọ ịkwụ ụgwọ ụtụ isi maka afọ atọ, ndebanye aha na National Pension Commission (PENCOM) na Industrial Training Fund (ITF).
Ndabere na chọpụta Southern Herald, iwu Public Procurement Act, ngalaba 8b, kwuru n’ụzọ doro anya na: “Ọ bụrụ na onye na-ere, onye na-ewu ma ọ bụ onye ndụmọdụ emezughị ọrụ gọọmenti n’ime afọ atọ tupu usoro inweta ihe amalite, a gaghị enye ya nkwekọrịta ọzọ.”
N’otu aka ahụ, ngalaba 31 (5) nke Companies Income Tax Act (CITA) na-egosi na a gaghị enye ụlọ ọrụ nkwekọrịta gọọmenti ma ọ bụrụ na ha enweghị akwụkwọ nkwụghachi ụgwọ ụtụ isi dị irè maka afọ atọ gara aga.
Southern Herald nyochara ego niile EFCC kwụrụ, chọpụta ndị natara ya, na ego a kwụrụ ha:
N’afọ 2020, EFCC natara ihe karịrị nde naira iri asaa na anọ maka ịzụta kọmputa ruru narị na iri itoolu na ọnụọgụgụ. A kwụrụ Digital Communications Kosult Nigeria Ltd ihe karịrnde iri atọ na anọ. A kwụrụ Bravo & Yellow Ltd ihe karịrị nde iri anọ. Nke mbụ kwesịrị inye kọmputa Dell Optiplex 3080 ruru narị na ọnụọgụgụ, ebe nke abụọ ga-enye kọmputa ruo iri itoolu.

N’afọ 2021, EFCC kwụrụ ụlọ ọrụ atọ ego ruru narị nde naịra abụọ na iri ise n’ime ugboro anọ:
A kwuru Patriots Arsenal Ltd karịrị nde naira iri na anọ maka: kabinetị mgbochi ọkụ (fireproof), igwe mkpịsị akwụkwọ ụlọ ọrụ, laserjet printer, kọmputa Dell Optiplex, na igwe akara.
A kwuru IT Touch Ltd ihe karịrị narị nde naịra iri asaa maka kọmputa desktọpụ n’enweghị nkọwa doro anya.
Na Julaị n’afọ ahụ, IT Touch Ltd nata kwara ihe karịrị nde naira iri abụọ na itoolu ọzọ maka kọmputa ndị ọzọ.
Jagmai Projects & Services Ltd natara ụgwọ na Nọvemba 21, 2021, maka: mmeghari ohuru ikike U-Fed, ngwaọrụ cloud analyzers, na ngwaọrụ analytics desktop n’enyeka iru oru ngwa ngwa.
N’afọ 2022, a kwụrụ Aptron Consults Ltd ego ruru ihe karịrị nde naira iri atọ na abụọ maka ịzụta na nlekọta igwe mkpịsị akwụkwọ. Ego ha na tara bu:
Ego karịrị nde naira iri na ise maka mmezi kwa afọ (Nọvemba 2022 ruo Nọvemba 2023)
Ego Karịrị nde naira iri na asaa maka igwe mkpịsị akwụkwọ na pritara n’enweghị nkọwa
Nnyocha nke otu ndị ọkà mmụta atọ nọ na Lọndọn gbasara nrụrụ aka nke E-transparency nke Nigeria na nrụrụ aka nke mmefu ego gọọmentị rụtụrụ aka n’ụzọ doro anya ọrụ akwadoro mmefu ego dịka otu n’ime akara uhie nke usoro ịzụ ahịa Naijiria.
Ha kwuru na ngwa ICT n’usoro mgbasa ozi nwere ike inye aka ịchọpụta oge mmefu ego adịghị doo anya, mmụba ụgwọ n’enweghị isi, mmefu ugboro ugboro, na izu ohi n’akụ na ụba.
N’afọ 2023, EFCC kpụpụtara ego kacha ukwuu maka kọmputa na igwe mkpịsị akwụkwọ, na ego karịrị nde naira narị na iri atọ na isii e jiri mezie ma zụta igwe pritara na mkpịsị akwụkwọ. Maka ịzụta na mmezi, ụlọ ọrụ abụọ natara ego a n’ime ụgwọ anọ:
Panasharp Technologies Ltd natara nde naira iri asaa na isii maka inye igwe mkpịsị akwụkwọ.
Aptron Consults Ltd natara ihe ruru nde naira iri na ise maka mmezi igwe mkpịsị akwụkwọ n’ụlọ isi EFCC.
Aptron natara ihe ruru nde naira iri na ato maka mmezi igwe n’ụlọ ọrụ EFCC dị iche iche (Dec 2020 – Nov 2021).
A kwụrụkwa ihe ruru nde naira iri ato maka inye akụrụngwa maka Xerox, Panasonic, Sharp, Ricoh, Gestetner.
EFCC kwụrụ Mubalco World-Wide Services Ltd ụgwọ maka inye igwe mkpịsị akwụkwọ 32 dị iche iche na isi ụlọ ọrụ ha. BudgIT chọpụtara na ọrụ mmefu ruru ihe karịrị narị ijeri naịra asaa e depụtara n’afọ mmefu 2024 enweghị nkọwa doro anya.
Southern Herald nyochara ụlọ ọrụ asato natara ego na-aka EFCC
Digital Communications Kosult Nigeria Limited, Bravo & Yellow Limited, Patriots Arsenal Limited, IT Touch Limited, Jagmai Projects and Services Limited, Aptron Consults Limited, Panasharp Technologies Limited, na Mubalco World-Wide Services Limited.
Nchọpụta CAC na B2BHint gosiri na ụlọ ọrụ ụfọdụ dịka Digital Communications Kosult adịghị na ndekọ CAC. Ọtụtụ ụlọ ọrụ dị “active” na Septemba 2024, ebe ụfọdụ ndị ọzọ dị “inactive”, nke a pụtara na ụlọ ọrụ ndị a dara idebe akwụkwọ ha kwa afọ na-alaghachi na Corporate Affairs Commission (CAC). Iwu CAMA kwuru na ụlọ ọrụ enweghị ndebanye kwa afọ enweghị ikike inweta nkwekọrịta gọọmenti.
N’ikpeazụ, ka anyị tụlee ihe efcc nwere na mmefu ego 2025 yana ihe ego a nwere ike ịzụta ma ọ bụrụ na ejiri ya mee ihe nke ọma
Ihe dịka nde naira iri abụọ na ise maka pritara HP & Deskjet.
Ihe dị ka narị nde naira maka igwe mkpịsị akwụkwọ Sharp, Panasonic, Ricoh & Xerox.
Ihe dịka nde naira iri abụọ na ise maka industrial scanners.
Ihe dịka narị nde naịra iri ise maka kọmputa HP na Dell (desktop na laptops).
Iji mata ihe efcc na-emefu yana ihe ọnụ ahịa igwe ndị a bụ n’ezie, Southern Herald chọpụtara na EFCC na-emefu ego karịa oke n’ịzụta akụrụngwa. Maka fotokopịa, ha họọrọ Sharp BP-30M31, nke na-eri ihe dịka nde naira ise otu, na mkpa ha bụ igwe iri na itoolu (19). Nke a ka dị n’ime mmefu ego a tụrụ. Ma, maka ndị na-enyocha akwụkwọ (scanner), ha tụrụ ihe dịka nde naira iri abụọ na ise, mana igwe dị ka HP LaserJet Enterprise MFP M528z na-eri ihe dị ka ihe dịka nde atọ na puku naira itoolu n’otu n’otu nke pụtara na ha nwere ike ịzụta naanị igwe isii (6)—na-egosi mmefu ego karịrị akarị. Ọtụtụ HP scanner dị na Jumia bụ ụdị Scanjet nke a na-eji n’ụlọ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ nta, ọ bụghị ụdị dị ike eji n’ụlọ ọrụ dị arọ. Maka kọmputa, ha tụrụ otu narị naịra na iri ise, ma ụdị dị ka DELL OptiPlex 7410 na-eri narị naịra isii na iri ise n’otu na out, nke pụtara na a pụrụ ịzụta usoro kọmputa narị abụọ na iri atọ (230)—na-egosi na mmefu ego a nwere ike ịbụ nke ukwuu ma e jiri ya tụnyere mkpa efu. N’ikwu ya n’ụzọ dị mkpirikpi, ụfọdụ n’ime ndị a zụtara dabara na mmefu ego, ma ụfọdụ dịka igwe na-enyocha akwụkwọ na kọmputa na-egosi ihe atụ nke imefu ego n’enweghị ezi nghọta ma ọ bụ n’ihe atụ nke igosi ọnụahịa dị elu.
EFCC kwuru na mgbasawanye ahụ na mmụba nke ọrụ ya bu ihe mere ha ji azu kọmputa mgbe niile. Onye nkwuchite ọnụ nke ya bu Commission, Dele Oyewale, kwechiri na ụlọ ọrụ ha bụ nnukwu ụlọ ọrụ. kwesịrị ịzụrụ ihe ndị a mgbe niile.
N’ịzaghachi gbasara nchoputa Southern Herald na ụlọ ọrụ ndị akwụgoro ụgwọ, Ọ rụtụrụ aka na EFCC anaghị eji usoro ịzụ ahịa ya egwu egwu.
Odee: Adedokun Theophilus. Onye ntụgharị asụsụ: Victor Nwakaozor